Check out our online
volunteering database
  
home we need volunteers I want to volunteer training and consultancy managing volunteers about volunteering

about us
contact us
news
events
volunteering stories
volunteering facts
not linked yet
downloads
links
membership
volt
European Voluntary Service
Vol4all Inclusive Volunteering
Ireland InVOLved
Safeguard

 

 

Olu Enye m aka n’efu n’obodo Ireland
Onye obula nwere ike inye aka n’efu. Onweghi ihe o gbochiri, ma ibu nwata, okenye, nwoke, nwanyi, onye aru siri ike ma-obu onye aru adighi ike. Ogbochighi ihe ma o buru na ina alu olu-ego ma-obu n’inweghi olu. O nwere ihe ipuru ime. Olu enyem aka n’efu g’enye gi afo-ojuju n’uzo puru iche.

N’Ireland olu enem aka n’efu putara ‘‘ inye oge na ike gi maka odinma obodo, ndi obodo, ndi madu na-abughi ezi n’ulo gi m’obu ochicho ozo di iche. I g’enye aka n’efu beru so ma-obu inyeghachi gi ego iji lua olu’’.

Uru olu enyem aka n’efu:
• Ihe ngosi maka ebe ilugoro olu nke inwere ike itinye n’akwukwo n’akowa gi bukwa nke ndi na-enye olu n’achosike.
• Ichoputa aka olu di iche nke I nwere.
• Inye aka n’uzo puru iche di nma.
• Inweta ozuzu.
• Inwe ohere ime ihe ihuru n’anya.
• Inwe ohere imata ndi madu ohu.
• I muta ihe gbasara odinala obodo Ireland.

Olu enyem aka n’efu agaghi:
• Akwu gi ugwo maka olu iluru.
• Agbara gi aka-ebe maka onodu nile.
• Akwu gi ugwo maka olu n’uzo ozo.
• Achotara gi olu.
• Enye gi ebe ana elekota umuaka.
• Akuziri gi asusu bekee.
• Azu gi n’ulo akwukwo.

Tule ihe ndia tupu iweputa onwe gi maka olu enyem aka n’efu:
• Gini mere iji cho inye aka? Gini ka I na-ele anya inweta site n’inye aka?
• Gini ka ichoro ime? Gini ka ichoghi ime?
• Gini ka ichoro imuta?
• Kedu ohere inwere?
• Ebee ka ichoro ilu olu enyem aka?

Oburu na ichoro ilu olu enyem aka, gaa hu Volunteering Ireland m’obu ndi n’ahu maka ebe a nalu olu enyem aka n’ogbe ebe ibi. Otudi iche iche n’acho ndi ga alu olu enyem aka n’efu. Otu ndia na-edekwa akwukwo n’egosi ebe olu di.

Ihe I ga-ahu n’aka ndi n’ewe n’olu inye aka n’efu:

Ndi n’ewe n’olu nwere ike ime ihe ndia ma I bia ka ewere gi n’olu. Ha nwere ike si gi:
• Deba ihe gbasara gi n’akwukwo ndi na-acho olu.
• Kpota madu abuo g’agbara gi aka-ebe.
• Bia maka ule iji mata m’itozuru olu olu.
• Ga weta akwukwo ndi uwe oji (Garda, Police) ma oburu na iga-alu ebe umuaka na ndi okenye no.
• Ha nwere ike inye gi ozuzu.

Biko mata na obughi nani otu-uzo ka ndi otu-olu enyem aka si eme. Ufodi nwere usoro ha ji alu olu, ndi ozo enweghi.

Ihe di mkpa bu ka ochicho onye olu enyem aka n’efu na nke otu n’ewe n’olu buru oyiri ibe.

Uzo ozo dikwa iche:

O buru na idgighi njikere inye aka ugbua, ma-obu ichoro imuta asusu bekee na olu-aka gi, ihe ndia di mkpa ka I tule ha:

Ulo akwukwo maka asusu bekee:
Ulo n nata akwukwo (libraries) nke ILAC na ndi ozo n‘akuzi maka asusu bekee. Nkuzi ndia bu n‘efu burukwa ihe a na-anara nke oma. Ulo nkuzi ndia n’akuzikwa maka odinala Ireland.

Ulo nkuzi Open Learning Centre n’enyekwa asambodo maka onye obula muru asusu n’olu aka n’aka ha. Kpoturu ha n’ekwe nti akara ya bu:018734333. Ulo nkuzi ha di na Central Library ILAC, Henry Street, Dublin 1.

Ebe nmuta ozo tinyere ulo akwukwo mgbede (evening classes), ulo uka, otu obodo di icheiche, otu egwuregwu di icheiche.

Download Nigeria (Igbo) brochure

 
Volunteer in your local county: 
  home | we need volunteers | I want to volunteer | training & consultancy | managing volunteers | about volunteering
about us | contact us | news | events | volunteers in action | downloads | links | membership | VOLT
copyright info | legal information | privacy statement | site map
  9019ms Copyright © 1997-2010 Volunteering Ireland